2 Kings 16

Ehaz eze Juda

1Ehaz
Ehaz na nna ya Jotam, chịkọrọ dịka eze na Juda nʼime senchuri nke asatọ (Tupu a mụọ Kraịst).
nwa Jotam, malitere ịbụ eze Juda nʼafọ nke iri na asaa nke ọchịchị eze Peka nwa Remalaya eze Izrel.
2Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Afọ iri na isii ka ọ chịkwara nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya, dịka nna ya Devid mere. 3Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, ọbụladị i ji nwa ya nwoke chụọ aja nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel. 4Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla.

5Mgbe ahụ, Rezin eze Aram na Peka nwa Remalaya, eze Izrel rigooro ịga buso Jerusalem agha, gbakwaa Ehaz gburugburu. Ma ha emerighị ya nʼagha. 6Nʼoge ahụ, Rezin eze Aram dọtaghachiri obodo Elat nye onwe ya, site na ị chụpụ ndị Juda bi nʼElat. Ndị Edọm bara nʼobodo Elat, ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa.

7Ehaz zigara ndị ozi ka ha gaa zie Tiglat-Pilesa, eze ndị Asịrịa ozi, sị ya, “Abụ m ohu gị, onyenwe m ka ị bụ. Bịa napụta m site nʼaka eze ndị Aram na eze ndị Izrel, ndị na-ebuso m agha.”
Arịrịọ enyemaka a site nʼebe eze Pul nọ, mere ka ndị Izrel tufuo ọnọdụ i nwere onwe ha. 2Ih 28:20; Dit 28:36
8Ehaz weere ọlaedo na ọlaọcha ahụtara nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼakụ niile dị nʼụlọeze zigara eze Asịrịa dịka onyinye. 9Eze ndị Asịrịa ṅara ya ntị site nʼibuso obodo Damaskọs agha na imeri ya. O gburu Rezin, bulaa mmadụ niile bi nʼime ya nʼike ka ha gaa biri nʼobodo Kia.

10Mgbe eze Ehaz gara Damaskọs izute Tiglat-Pilesa bụ eze Asịrịa. Ọ hụrụ otu ebe nchụaja nke dị na Damaskọs. O zigaara Ụraya onye nchụaja oyiyi ebe ịchụ aja ahụ. O dekwara ihe gbasara ya nʼakwụkwọ, nke ga-akọwa otu e si ewu ya. 11Ya mere, Ụraya onye nchụaja, wuru ebe ịchụ aja nke dị ka nke ahụ Ehaz hụrụ na Damaskọs. O wuchara ya tupu eze alọta. 12Mgbe eze si Damaskọs lọta na Juda, ọ hụrụ ebe ịchụ aja ahụ, bịaruo ya nso, doo onyinye ịchụ aja ya nʼelu ya. 13Ọ chụrụ aja nsure ọkụ, na aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na aja onyinye mkpụrụ ọka. Ọ wụkwasịrị onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, fesakwa ọbara aja udo ya niile nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 14O wepụrụ ebe ịchụ aja bronz nke dị nʼihu Onyenwe anyị, o sitere nʼebe ọ dị nʼihu ụlọnsọ ahụ, nʼetiti ebe ịchụ aja ọhụrụ na ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bute ya nʼakụkụ ugwu nke ebe ịchụ aja ọhụrụ ya.

15Eze Ehaz nyere Ụraya, bụ onyeisi nchụaja iwu, sị, “Ọ bụ nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ a ka ị ga na-esure aja nsure ọkụ ụtụtụ niile, na onyinye mkpụrụ ọka nke uhuruchi niile, na aja nsure ọkụ eze, na onyinye mkpụrụ ọka nke eze, na aja na onyinye nke ndị niile nʼala a, ya na onyinye mkpụrụ ọka ha niile na onyinye ihe ọṅụṅụ ha niile. Fekwasị ọbara niile e ji chụọ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. Ma ebe ịchụ aja ọla ahụ ga-adịrị m iji jụta ase.” 16Ụraya onye nchụaja mere ihe niile dịka eze Ehaz nyere ya nʼiwu.

17Eze bụ Ehaz wepụrụ ihe njikọ niile jikọrọ ihe ndọkwasị ahụ niile a na-ebugharị ebugharị. O wepụrụ efere ukwu ịdọba mmiri a dọkwasịrị nʼelu ehi ọla ahụ dị nʼokpuru ya, ma dọkwasị ya nʼelu nkume. 18Nʼihi imekwa ka obi tọọ eze Asịrịa ụtọ, o wepụrụ ụzọ a na-esite maka ụbọchị izuike nke e wuru nʼime ụlọnsọ, na ụzọ mbata eze si abanye nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

19Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ehaz, na ihe ndị o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda? 20Ehaz soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Hezekaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Copyright information for IboBIU